Aịzaya 45:1
Isaiah 45:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ, bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya, napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile, megheere ya ọnụ ụzọ niile nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya.
Isaiah 45:1 in English
Isaiah 45:1 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says to Cyrus His anointed, whose right hand I have grasped to subdue nations before him, to disarm kings, to open the doors before him, so that the gates will not be shut:
Context
1“Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ,
bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya
megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya,
napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile,
megheere ya ọnụ ụzọ niile
nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya. 2Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị
kwazee ugwu ukwu niile,
tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile
gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche. 3Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara,
akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche.
Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.