Aịzaya 45:3
Isaiah 45:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara, akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche. Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile.
Isaiah 45:3 in English
Isaiah 45:3 · Berean Standard Bible
I will give you the treasures of darkness and the riches hidden in secret places, so that you may know that I am the LORD, the God of Israel, who calls you by name.
Context
1“Nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu nye ohu ya nke o tere mmanụ,
bụ Sairọs, onye m ga-eji aka nri ya
megide mba niile, mee ka ha nọrọ nʼokpuru ya,
napụkwa ndị eze ngwa agha ha niile,
megheere ya ọnụ ụzọ niile
nke na ọ dịkwaghị ọnụ ụzọ ama a ga-emechibido ya. 2Mụ onwe m ga-ebu ụzọ gaa nʼihu gị
kwazee ugwu ukwu niile,
tiwasịa ibo ọnụ ụzọ bronz niile
gbuwakwaa mkpọrọ igwe dị iche iche. 3Aga m enye gị akụ niile e zoro nʼebe ọchịchịrị gbara,
akụnụba niile e zoro nʼebe nzuzo dị iche iche.
Ka ị mata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
bụ Chineke nke Izrel, onye ahụ kpọrọ gị aha, na-eme ihe ndị a niile. 4Nʼihi Jekọb bụ ohu m,
nʼihi Izrel onye m họpụtara nye onwe m,
ka m ji kpọọ gị aha gị
nyekwa gị aha nke nsọpụrụ,*
maọbụ ezie na ị maghị onye m bụ. 5Ọ bụ m bụ Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa onye ọzọ dị;
ewezuga m, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.
Ọ bụ ezie na ị maghị m,
ma aga m eme ka ị dịrị ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.