Native Bible

Isaiah 43:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma unu akpọkughị m, Jekọb, kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel.

Isaiah 43:22 in English

Isaiah 43:22 · Berean Standard Bible

But you have not called on Me, O Jacob, because you have grown weary of Me, O Israel.

Context

20Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m, nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m, nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu, nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara. 21Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m. 22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb, kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel. 23I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ, maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m. O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka, maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ. 24Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ, maọbụ were abụba anụ nke aja unu niile mee ka obi tọọ m ụtọ. Kama ọ bụ naanị mmehie unu ka unu na-ebokwasị m, unu ejirila ajọ omume unu mee ka ike gwụsịa m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.