Aịzaya 43:23
Isaiah 43:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ, maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m. O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka, maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ.
Isaiah 43:23 in English
Isaiah 43:23 · Berean Standard Bible
You have not brought Me sheep for burnt offerings, nor honored Me with your sacrifices. I have not burdened you with offerings, nor wearied you with frankincense.
Context
21Ndị m kpụrụ nye onwe m,
ka ha kọsaa akụkọ otuto m. 22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb,
kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel. 23I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ,
maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m.
O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka,
maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ. 24Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ,
maọbụ were abụba anụ nke aja unu niile mee ka obi tọọ m ụtọ.
Kama ọ bụ naanị mmehie unu ka unu na-ebokwasị m,
unu ejirila ajọ omume unu mee ka ike gwụsịa m. 25“Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu.
Ana m emekwa ya nʼihi na ọ dị m mma nʼobi ime ya.
Agakwaghị m echeta mmehie unu ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.