Aịzaya 43:21
Isaiah 43:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m.
Isaiah 43:21 in English
Isaiah 43:21 · Berean Standard Bible
The people I formed for Myself will declare My praise.
Context
19Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime.
Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya?
Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara,
na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu. 20Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m,
nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m,
nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara,
meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu,
nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara. 21Ndị m kpụrụ nye onwe m,
ka ha kọsaa akụkọ otuto m. 22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb,
kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel. 23I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ,
maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m.
O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka,
maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.