Native Bible

Isaiah 43:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m.

Isaiah 43:21 in English

Isaiah 43:21 · Berean Standard Bible

The people I formed for Myself will declare My praise.

Context

19Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime. Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya? Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara, na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu. 20Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m, nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m, nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu, nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara. 21Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m. 22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb, kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel. 23I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ, maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m. O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka, maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.