Aịzaya 43:19
Isaiah 43:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime. Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya? Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara, na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu.
Isaiah 43:19 in English
Isaiah 43:19 · Berean Standard Bible
Behold, I am about to do something new; even now it is coming. Do you not see it? Indeed, I will make a way in the wilderness and streams in the desert.
Context
17Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta,
ndị agha na ụsụ ha achịkọtara ọnụ,
mee ha ka ha dinaa nʼebe ahụ, ghara ibilitekwa ọzọ,
dịka ha bụ ọkụ ogho oriọna e menyụrụ emenyụ. 18“Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga;
unu atụgharịkwala uche unu na ha. 19Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime.
Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya?
Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara,
na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu. 20Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m,
nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m,
nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara,
meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu,
nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara. 21Ndị m kpụrụ nye onwe m,
ka ha kọsaa akụkọ otuto m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.