Aịzaya 43:20
Isaiah 43:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m, nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m, nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu, nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara.
Isaiah 43:20 in English
Isaiah 43:20 · Berean Standard Bible
The beasts of the field will honor Me, the jackals * and the ostriches,* because I provide water in the wilderness and rivers in the desert, to give drink to My chosen people.
Context
18“Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga;
unu atụgharịkwala uche unu na ha. 19Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime.
Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya?
Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara,
na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu. 20Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m,
nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m,
nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara,
meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu,
nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara. 21Ndị m kpụrụ nye onwe m,
ka ha kọsaa akụkọ otuto m. 22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb,
kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.