Aịzaya 43:24
Isaiah 43:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ, maọbụ were abụba anụ nke aja unu niile mee ka obi tọọ m ụtọ. Kama ọ bụ naanị mmehie unu ka unu na-ebokwasị m, unu ejirila ajọ omume unu mee ka ike gwụsịa m.
Isaiah 43:24 in English
Isaiah 43:24 · Berean Standard Bible
You have not bought Me sweet cane with your silver, nor satisfied Me with the fat of your sacrifices. But you have burdened Me with your sins; you have wearied Me with your iniquities.
Context
22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb,
kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel. 23I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ,
maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m.
O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka,
maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ. 24Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ,
maọbụ were abụba anụ nke aja unu niile mee ka obi tọọ m ụtọ.
Kama ọ bụ naanị mmehie unu ka unu na-ebokwasị m,
unu ejirila ajọ omume unu mee ka ike gwụsịa m. 25“Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu.
Ana m emekwa ya nʼihi na ọ dị m mma nʼobi ime ya.
Agakwaghị m echeta mmehie unu ọzọ. 26Chetara m ihe gara aga,
ka anyị rụrịta ụka nʼetiti onwe anyị,
doo okwu gị nʼusoro igosi na ị bụ onye ikpe na-amaghị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.