Aịzaya 43:25
Isaiah 43:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu. Ana m emekwa ya nʼihi na ọ dị m mma nʼobi ime ya. Agakwaghị m echeta mmehie unu ọzọ.
Isaiah 43:25 in English
Isaiah 43:25 · Berean Standard Bible
I, yes I, am He who blots out your transgressions for My own sake and remembers your sins no more.
Context
23I kpụrụghị atụrụ wetara m maka aja nsure ọkụ,
maọbụ jiri aja niile sọpụrụ m.
O nweghị mgbe m kwagidere gị ka i wetara m onyinye mkpụrụ ọka,
maọbụ mee ka ike gwụ gị site nʼịna gị ụda na-esi isi ụtọ. 24Unu ewetabereghị m ụda kalamus na-esi isi ụtọ,
maọbụ were abụba anụ nke aja unu niile mee ka obi tọọ m ụtọ.
Kama ọ bụ naanị mmehie unu ka unu na-ebokwasị m,
unu ejirila ajọ omume unu mee ka ike gwụsịa m. 25“Mụ onwe m, ọ bụ naanị mụ onwe m, bụ onye na-ehichapụ mmehie unu.
Ana m emekwa ya nʼihi na ọ dị m mma nʼobi ime ya.
Agakwaghị m echeta mmehie unu ọzọ. 26Chetara m ihe gara aga,
ka anyị rụrịta ụka nʼetiti onwe anyị,
doo okwu gị nʼusoro igosi na ị bụ onye ikpe na-amaghị. 27Site na mmalite, nna nna unu ha mehiere megide m.
Ndị m dunyere ka ha kuziere unu ihe nupukwara isi megide m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.