Aịzaya 41:6
Isaiah 41:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị, “Nwee obi ike.”
Isaiah 41:6 in English
Isaiah 41:6 · Berean Standard Bible
Each one helps the other and says to his brother, “Be strong!”
Context
4Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya,
na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite?
Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile,
onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.” 5Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu;
ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji.
Ha zukọtara bịa nso. 6Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị,
“Nwee obi ike.” 7Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume.
Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ,
na-agba onye na-akụ osiama ume.
Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.”
Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda. 8“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m,
Jekọb, onye m họpụtara,
gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.