Aịzaya 41:5
Isaiah 41:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu; ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji. Ha zukọtara bịa nso.
Isaiah 41:5 in English
Isaiah 41:5 · Berean Standard Bible
The islands see and fear; the ends of the earth tremble. They approach and come forward.
Context
3Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla.
E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ. 4Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya,
na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite?
Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile,
onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.” 5Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu;
ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji.
Ha zukọtara bịa nso. 6Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị,
“Nwee obi ike.” 7Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume.
Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ,
na-agba onye na-akụ osiama ume.
Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.”
Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.