Aịzaya 41:4
Isaiah 41:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya, na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite? Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile, onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.”
Isaiah 41:4 in English
Isaiah 41:4 · Berean Standard Bible
Who has performed this and carried it out, calling forth the generations from the beginning? I, the LORD—the first and the last— I am He.”
Context
2“Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa,
onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi?
O weere mba niile nyefee ya nʼaka,
meriekwa ndị eze nʼihu ya.
O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu,
jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị. 3Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla.
E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ. 4Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya,
na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite?
Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile,
onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.” 5Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu;
ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji.
Ha zukọtara bịa nso. 6Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị,
“Nwee obi ike.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.