Aịzaya 41:2
Isaiah 41:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa, onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi? O weere mba niile nyefee ya nʼaka, meriekwa ndị eze nʼihu ya. O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu, jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị.
Isaiah 41:2 in English
Isaiah 41:2 · Berean Standard Bible
Who has aroused one from the east and called him to his feet in righteousness *? He hands nations over to him and subdues kings before him. He turns them to dust with his sword, to windblown chaff with his bow.
Context
1Nọrọnụ jụụ nʼihu m, unu mba niile mmiri gbara gburugburu!
Ka mba niile gbanwee ike ha.
Ka ha pụta kwuo okwu.
Ka anyị zukọtaa nʼebe ikpe ikpe. 2“Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa,
onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi?
O weere mba niile nyefee ya nʼaka,
meriekwa ndị eze nʼihu ya.
O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu,
jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị. 3Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla.
E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ. 4Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya,
na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite?
Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile,
onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.