Aịzaya 41:7
Isaiah 41:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume. Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ, na-agba onye na-akụ osiama ume. Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.” Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda.
Isaiah 41:7 in English
Isaiah 41:7 · Berean Standard Bible
The craftsman encourages the goldsmith, and he who wields the hammer cheers him who strikes the anvil, saying of the welding, “It is good.” He nails it down so it will not be toppled.
Context
5Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu;
ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji.
Ha zukọtara bịa nso. 6Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị,
“Nwee obi ike.” 7Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume.
Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ,
na-agba onye na-akụ osiama ume.
Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.”
Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda. 8“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m,
Jekọb, onye m họpụtara,
gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m. 9Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu,
gwa unu na ohu m ka unu bụ,
nʼihi na ahọpụtala m unu,
agakwaghị m ahapụ unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.