Aịzaya 41:8
Isaiah 41:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m, Jekọb, onye m họpụtara, gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m.
Isaiah 41:8 in English
Isaiah 41:8 · Berean Standard Bible
“But you, O Israel, My servant, Jacob, whom I have chosen, descendant of Abraham My friend—
Context
6Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị,
“Nwee obi ike.” 7Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume.
Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ,
na-agba onye na-akụ osiama ume.
Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.”
Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda. 8“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m,
Jekọb, onye m họpụtara,
gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m. 9Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu,
gwa unu na ohu m ka unu bụ,
nʼihi na ahọpụtala m unu,
agakwaghị m ahapụ unu. 10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.
Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.
Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;
aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.