Aịzaya 41:10
Isaiah 41:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.
Isaiah 41:10 in English
Isaiah 41:10 · Berean Standard Bible
Do not fear, for I am with you; do not be afraid, for I am your God. I will strengthen you; I will surely help you; I will uphold you with My right hand of righteousness.
Context
8“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m,
Jekọb, onye m họpụtara,
gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m. 9Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu,
gwa unu na ohu m ka unu bụ,
nʼihi na ahọpụtala m unu,
agakwaghị m ahapụ unu. 10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.
Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.
Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;
aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu. 11“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere,
ihere ga-emekwa ha.
Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu,
bụrụ ndị lara nʼiyi. 12Unu ga-ele anya ha, chọọ ha,
ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ.
Ndị a na-ebuso unu agha
ga-abụ naanị ihe efu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.