Aịzaya 41:12
Isaiah 41:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga-ele anya ha, chọọ ha, ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ. Ndị a na-ebuso unu agha ga-abụ naanị ihe efu.
Isaiah 41:12 in English
Isaiah 41:12 · Berean Standard Bible
You will seek them but will not find them. Those who wage war against you will come to nothing.
Context
10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.
Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.
Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;
aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu. 11“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere,
ihere ga-emekwa ha.
Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu,
bụrụ ndị lara nʼiyi. 12Unu ga-ele anya ha, chọọ ha,
ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ.
Ndị a na-ebuso unu agha
ga-abụ naanị ihe efu. 13Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ejidesi aka nri gị ike
bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu;
aga m enyere gị aka.’ 14Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb,
unu Izrel dị nta, atụla egwu,
nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.