Aịzaya 41:13
Isaiah 41:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ejidesi aka nri gị ike bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu; aga m enyere gị aka.’
Isaiah 41:13 in English
Isaiah 41:13 · Berean Standard Bible
For I am the LORD your God, who takes hold of your right hand and tells you: Do not fear, I will help you.
Context
11“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere,
ihere ga-emekwa ha.
Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu,
bụrụ ndị lara nʼiyi. 12Unu ga-ele anya ha, chọọ ha,
ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ.
Ndị a na-ebuso unu agha
ga-abụ naanị ihe efu. 13Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ejidesi aka nri gị ike
bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu;
aga m enyere gị aka.’ 14Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb,
unu Izrel dị nta, atụla egwu,
nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel. 15“Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka
nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze.
Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha,
meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.