Aịzaya 41:11
Isaiah 41:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere, ihere ga-emekwa ha. Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu, bụrụ ndị lara nʼiyi.
Isaiah 41:11 in English
Isaiah 41:11 · Berean Standard Bible
Behold, all who rage against you will be ashamed and disgraced; those who contend with you will be reduced to nothing and will perish.
Context
9Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu,
gwa unu na ohu m ka unu bụ,
nʼihi na ahọpụtala m unu,
agakwaghị m ahapụ unu. 10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.
Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.
Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;
aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu. 11“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere,
ihere ga-emekwa ha.
Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu,
bụrụ ndị lara nʼiyi. 12Unu ga-ele anya ha, chọọ ha,
ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ.
Ndị a na-ebuso unu agha
ga-abụ naanị ihe efu. 13Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ejidesi aka nri gị ike
bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu;
aga m enyere gị aka.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.