Aịzaya 40:27
Isaiah 40:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb? Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị, “Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị, Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?”
Isaiah 40:27 in English
Isaiah 40:27 · Berean Standard Bible
Why do you say, O Jacob, and why do you assert, O Israel, “My way is hidden from the LORD, and my claim is ignored by my God”?
Context
25“Olee onye unu ga-eji tụnyere m?
Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ. 26Lee anya nʼeluigwe;
onye kere kpakpando ndị a niile?
Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ?
Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya?
Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu,
ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu. 27Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb?
Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị,
“Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị,
Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?” 28Ọ bụ na ị matabeghị?
Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya?
Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi,
Onye kere nsọtụ niile nke ụwa.
Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya.
O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya. 29Ọ na-enye ndị na-ada mba ike,
na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.