Aịzaya 40:26
Isaiah 40:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee anya nʼeluigwe; onye kere kpakpando ndị a niile? Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ? Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya? Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu, ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu.
Isaiah 40:26 in English
Isaiah 40:26 · Berean Standard Bible
Lift up your eyes on high: Who created all these? He leads forth the starry host by number; He calls each one by name. Because of His great power and mighty strength, not one of them is missing.
Context
24Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute.
Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute,
mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala,
mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha,
bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ. 25“Olee onye unu ga-eji tụnyere m?
Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ. 26Lee anya nʼeluigwe;
onye kere kpakpando ndị a niile?
Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ?
Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya?
Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu,
ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu. 27Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb?
Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị,
“Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị,
Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?” 28Ọ bụ na ị matabeghị?
Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya?
Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi,
Onye kere nsọtụ niile nke ụwa.
Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya.
O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.