Aịzaya 40:24
Isaiah 40:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute. Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute, mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala, mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha, bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
Isaiah 40:24 in English
Isaiah 40:24 · Berean Standard Bible
No sooner are they planted, no sooner are they sown, no sooner have their stems taken root in the ground, than He blows on them and they wither, and a whirlwind sweeps them away like stubble.
Context
22Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu.
Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana.
Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa,
were ya mere ebe obibi ya. 23Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa,
mee ha ka ha ghọọ ihe efu. 24Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute.
Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute,
mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala,
mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha,
bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ. 25“Olee onye unu ga-eji tụnyere m?
Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ. 26Lee anya nʼeluigwe;
onye kere kpakpando ndị a niile?
Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ?
Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya?
Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu,
ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.