Aịzaya 40:25
Isaiah 40:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Olee onye unu ga-eji tụnyere m? Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ.
Isaiah 40:25 in English
Isaiah 40:25 · Berean Standard Bible
“To whom will you liken Me, or who is My equal?” asks the Holy One.
Context
23Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa,
mee ha ka ha ghọọ ihe efu. 24Mgbe a na-ele ha anya, ha na-adị ka ihe a kụrụ nʼubi nke na-epute epute.
Mgbe a kụrụ ha, mgbe ha na-epute,
mgbe ha na-amanye mgbọrọgwụ nʼala,
mgbe ahụ kwa ka Onyenwe anyị na-ezite ifufe nke na-akpọnwụ ha,
bufuo ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ. 25“Olee onye unu ga-eji tụnyere m?
Onye kwa ka mụ na ya ha?” Nke a bụ ihe Onye Nsọ Izrel na-ajụ. 26Lee anya nʼeluigwe;
onye kere kpakpando ndị a niile?
Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ?
Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya?
Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu,
ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu. 27Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb?
Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị,
“Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị,
Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.