Aịzaya 40:28
Isaiah 40:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.
Isaiah 40:28 in English
Isaiah 40:28 · Berean Standard Bible
Do you not know? Have you not heard? The LORD is the everlasting God, the Creator of the ends of the earth. He will not grow tired or weary; His understanding is beyond searching out.
Context
26Lee anya nʼeluigwe;
onye kere kpakpando ndị a niile?
Onye na-edu ha dịka onye ọzụzụ atụrụ?
Onye na-akpọ nke ọbụla aha ya?
Ọ bụ site nʼamamihe na ike ya dị ukwuu,
ka o ji eme ka ha ghara ịkpafu. 27Ọ bụ nʼihi gịnị ka i ji na-asị, gị Jekọb?
Ọ bụkwa gịnị mere gị Izrel, i ji na-atamu ntamu na-asị,
“Ụzọ m bụ ihe ezonarịrị Onyenwe anyị,
Chineke adịghị etinyekwa anya ya nʼihe metụtara m?” 28Ọ bụ na ị matabeghị?
Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya?
Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi,
Onye kere nsọtụ niile nke ụwa.
Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya.
O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya. 29Ọ na-enye ndị na-ada mba ike,
na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume. 30Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha.
E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.