Aịzaya 40:19
Isaiah 40:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ, nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya, ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha.
Isaiah 40:19 in English
Isaiah 40:19 · Berean Standard Bible
To an idol that a craftsman casts and a metalworker overlays with gold and fits with silver chains?
Context
17O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya;
ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru,
dịka ihe na-erughị ihe efu. 18Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke?
Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri? 19Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ,
nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya,
ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha. 20Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu a
na-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure.
Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma,
onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada. 21Ọ bụ na unu amaghị?
Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya?
Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite?
Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.