Native Bible

Isaiah 40:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya; ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru, dịka ihe na-erughị ihe efu.

Isaiah 40:17 in English

Isaiah 40:17 · Berean Standard Bible

All the nations are as nothing before Him; He regards them as nothingness and emptiness.

Context

15Nʼezie, mba niile dị iche iche dịka otu ntupụta mmiri tanyere nʼime efere; a na-agụnye ha dịka uzuzu dị nʼelu ihe ọtụtụ e ji atụ ihe; ọ na-atụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu dịka a ga-asị na ha bụ uzuzu ọma na-adịghị arọ. 16Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja. Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja. 17O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya; ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru, dịka ihe na-erughị ihe efu. 18Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke? Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri? 19Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ, nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya, ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.