Aịzaya 40:17
Isaiah 40:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya; ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru, dịka ihe na-erughị ihe efu.
Isaiah 40:17 in English
Isaiah 40:17 · Berean Standard Bible
All the nations are as nothing before Him; He regards them as nothingness and emptiness.
Context
15Nʼezie, mba niile dị iche iche dịka otu ntupụta mmiri tanyere nʼime efere;
a na-agụnye ha dịka uzuzu dị nʼelu ihe ọtụtụ e ji atụ ihe;
ọ na-atụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu dịka a ga-asị na ha bụ uzuzu ọma na-adịghị arọ. 16Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja.
Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja. 17O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya;
ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru,
dịka ihe na-erughị ihe efu. 18Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke?
Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri? 19Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ,
nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya,
ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.