Aịzaya 40:18
Isaiah 40:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke? Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri?
Isaiah 40:18 in English
Isaiah 40:18 · Berean Standard Bible
To whom will you liken God? To what image will you compare Him?
Context
16Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja.
Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja. 17O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya;
ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru,
dịka ihe na-erughị ihe efu. 18Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke?
Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri? 19Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ,
nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya,
ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha. 20Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu a
na-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure.
Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma,
onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.