Aịzaya 40:16
Isaiah 40:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja. Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja.
Isaiah 40:16 in English
Isaiah 40:16 · Berean Standard Bible
Lebanon is not sufficient for fuel, nor its animals enough for a burnt offering.
Context
14Ọ bụ onye ka Onyenwe anyị gakwuru gbaa izu ka ọ kọwaara ya ihe,
ọ bụ onye ziri ya ụzọ bụ nke dị mma?
Onye bụ onye ahụ kuziri ya ihe ọmụma,
maọbụ gosi ya ụzọ nke nghọta? 15Nʼezie, mba niile dị iche iche dịka otu ntupụta mmiri tanyere nʼime efere;
a na-agụnye ha dịka uzuzu dị nʼelu ihe ọtụtụ e ji atụ ihe;
ọ na-atụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu dịka a ga-asị na ha bụ uzuzu ọma na-adịghị arọ. 16Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja.
Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja. 17O nweghị ihe ọbụla mba niile dị nʼụwa bụ nʼihu ya;
ọ na-agụ ha ka ihe na-abaghị uru,
dịka ihe na-erughị ihe efu. 18Onye kwanụ ka unu ga-eji tụnyere Chineke?
Olee ụdị oyiyi unu ga-eji kọwaa ihe o yiri?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.