Aịzaya 40:21
Isaiah 40:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ na unu amaghị? Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya? Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite? Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa?
Isaiah 40:21 in English
Isaiah 40:21 · Berean Standard Bible
Do you not know? Have you not heard? Has it not been declared to you from the beginning? Have you not understood since the foundation of the earth?
Context
19Ma gbasara arụsị apịrị apị, nke onye na-akwa nka ọla tụrụ,
nke onye ọkpụ ụzụ ọlaedo na-eji ọlaedo techie ya,
ọ bụkwa ya ka ọ na-akpụrụ ọlaọcha. 20Ma onye ogbenye na-enweghị ịchụ aja dị otu a
na-ahọrọ osisi nke na-agaghị ere ure.
Ọ na-akpọtara onwe ya onye maara akwa ǹka osisi nke ọma,
onye ga-apịtara ya oyiyi arụsị nke na-agaghị ada ada. 21Ọ bụ na unu amaghị?
Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya?
Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite?
Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa? 22Na Chineke nọ nʼelu ocheeze ya nke gbara ụwa gburugburu.
Ndị nọ nʼụwa dịkwa ka ụmụ ụkpana.
Ọ bụ ya tụsara eluigwe dịka akwa,
were ya mere ebe obibi ya. 23Ọ na-eweda ndị ukwu niile nke ụwa,
mee ha ka ha ghọọ ihe efu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.