Aịzaya 40:11
Isaiah 40:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.
Isaiah 40:11 in English
Isaiah 40:11 · Berean Standard Bible
He tends His flock like a shepherd; He gathers the lambs in His arms and carries them close to His heart. He gently leads the nursing ewes.
Context
9Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn,
rigoro nʼelu ugwu;
gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem,
welie olu gị elu tisie mkpu ike;
e, tisie mkpu ike, atụla egwu.
Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha:
“Chineke unu na-abịa.” 10Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike,
ike aka ya ka o ji achị.
Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka,
ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ. 11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ.
Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya.
Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara. 12Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri?
Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe?
Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu?
Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu?
Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta? 13Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke Onyenwe anyị,
maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.