Native Bible

Isaiah 40:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri? Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe? Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu? Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu? Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta?

Isaiah 40:12 in English

Isaiah 40:12 · Berean Standard Bible

Who has measured the waters in the hollow of his hand, or marked off the heavens with the span of his hand? Who has held the dust of the earth in a basket, or weighed the mountains on a scale and the hills with a balance?

Context

10Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ. 11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara. 12Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri? Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe? Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu? Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu? Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta? 13Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke Onyenwe anyị, maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe? 14Ọ bụ onye ka Onyenwe anyị gakwuru gbaa izu ka ọ kọwaara ya ihe, ọ bụ onye ziri ya ụzọ bụ nke dị mma? Onye bụ onye ahụ kuziri ya ihe ọmụma, maọbụ gosi ya ụzọ nke nghọta?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.