Aịzaya 40:10
Isaiah 40:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ.
Isaiah 40:10 in English
Isaiah 40:10 · Berean Standard Bible
Behold, the Lord GOD comes with might, and His arm establishes His rule. His reward is with Him, and His recompense accompanies Him.
Context
8E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa,
ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.” 9Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn,
rigoro nʼelu ugwu;
gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem,
welie olu gị elu tisie mkpu ike;
e, tisie mkpu ike, atụla egwu.
Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha:
“Chineke unu na-abịa.” 10Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike,
ike aka ya ka o ji achị.
Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka,
ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ. 11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ.
Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya.
Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara. 12Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri?
Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe?
Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu?
Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu?
Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.