Native Bible

Isaiah 40:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn, rigoro nʼelu ugwu; gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem, welie olu gị elu tisie mkpu ike; e, tisie mkpu ike, atụla egwu. Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha: “Chineke unu na-abịa.”

Isaiah 40:9 in English

Isaiah 40:9 · Berean Standard Bible

Go up on a high mountain, O Zion, herald of good news. Raise your voice loudly, O Jerusalem, herald of good news. Lift it up,* do not be afraid! Say to the cities of Judah, “Here is your God!”

Context

7Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,* nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ. 8E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa, ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.” 9Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn, rigoro nʼelu ugwu; gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem, welie olu gị elu tisie mkpu ike; e, tisie mkpu ike, atụla egwu. Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha: “Chineke unu na-abịa.” 10Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ. 11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.