Aịzaya 40:7
Isaiah 40:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,* nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ.
Isaiah 40:7 in English
Isaiah 40:7 · Berean Standard Bible
The grass withers and the flowers fall when the breath of the LORD blows on them; indeed, the people are grass.
Context
5Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị,
mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu.
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.” 6Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!”
Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?”
“Mmadụ niile dị ka ahịhịa,
ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa. 7Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,*
nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya.
Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ. 8E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa,
ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.” 9Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn,
rigoro nʼelu ugwu;
gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem,
welie olu gị elu tisie mkpu ike;
e, tisie mkpu ike, atụla egwu.
Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha:
“Chineke unu na-abịa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.