Native Bible

Isaiah 34:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe, lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm, ndị m mara ikpe mbibi.

Isaiah 34:5 in English

Isaiah 34:5 · Berean Standard Bible

When My sword has drunk its fill in the heavens, then it will come down upon Edom, upon the people I have devoted to destruction.

Context

3Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ. Ozu ha ga-esikwa isi. Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha. 4Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze, a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ, kpakpando niile ga-ada dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ, dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ. 5Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe, lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm, ndị m mara ikpe mbibi. 6Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara, abụba kpuchikwara ya, ọbara ụmụ atụrụ na mkpi na abụba sitere nʼakụrụ ebule nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra. O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm. 7Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa, ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta. Ala ga-ejupụta nʼọbara ha. Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.