Aịzaya 34:7
Isaiah 34:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa, ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta. Ala ga-ejupụta nʼọbara ha. Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha.
Isaiah 34:7 in English
Isaiah 34:7 · Berean Standard Bible
And the wild oxen will fall with them, the young bulls with the strong ones. Their land will be drenched with blood, and their soil will be soaked with fat.
Context
5Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe,
lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm,
ndị m mara ikpe mbibi. 6Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara,
abụba kpuchikwara ya,
ọbara ụmụ atụrụ na mkpi
na abụba sitere nʼakụrụ ebule
nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra.
O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm. 7Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa,
ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta.
Ala ga-ejupụta nʼọbara ha.
Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha. 8Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ.
Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn. 9Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii,
uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ),
ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.