Aịzaya 34:8
Isaiah 34:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ. Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn.
Isaiah 34:8 in English
Isaiah 34:8 · Berean Standard Bible
For the LORD has a day of vengeance, a year of recompense for the cause of Zion.*
Context
6Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara,
abụba kpuchikwara ya,
ọbara ụmụ atụrụ na mkpi
na abụba sitere nʼakụrụ ebule
nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra.
O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm. 7Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa,
ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta.
Ala ga-ejupụta nʼọbara ha.
Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha. 8Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ.
Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn. 9Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii,
uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ),
ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii. 10Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie;
anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi.
Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;
ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.