Native Bible

Isaiah 34:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii, uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ), ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii.

Isaiah 34:9 in English

Isaiah 34:9 · Berean Standard Bible

Edom’s streams will be turned to tar, and her soil to sulfur; her land will become a blazing pitch.

Context

7Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa, ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta. Ala ga-ejupụta nʼọbara ha. Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha. 8Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ. Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn. 9Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii, uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ), ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii. 10Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie; anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi. Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ. 11Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya, ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ. Chineke ga-eseti nʼelu Edọm, eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara, na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.