Aịzaya 34:11
Isaiah 34:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya, ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ. Chineke ga-eseti nʼelu Edọm, eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara, na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu.
Isaiah 34:11 in English
Isaiah 34:11 · Berean Standard Bible
The desert owl and screech owl will possess it, and the great owl and raven will dwell in it.* The LORD will stretch out over Edom a measuring line of chaos and a plumb line of destruction.
Context
9Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii,
uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ),
ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii. 10Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie;
anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi.
Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;
ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ. 11Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya,
ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ.
Chineke ga-eseti nʼelu Edọm,
eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara,
na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu. 12Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze.
Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa. 13Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile;
ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu,
ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa
na nke ikwighịkwighị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.