Aịzaya 34:12
Isaiah 34:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze. Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.
Isaiah 34:12 in English
Isaiah 34:12 · Berean Standard Bible
No nobles will be left to proclaim a king, and all her princes will come to nothing.
Context
10Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie;
anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi.
Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;
ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ. 11Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya,
ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ.
Chineke ga-eseti nʼelu Edọm,
eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara,
na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu. 12Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze.
Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa. 13Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile;
ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu,
ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa
na nke ikwighịkwighị. 14Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ.
Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa.
Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha,
chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.