Aịzaya 34:10
Isaiah 34:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie; anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi. Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.
Isaiah 34:10 in English
Isaiah 34:10 · Berean Standard Bible
It will not be quenched—day or night. Its smoke will ascend forever. From generation to generation it will lie desolate; no one will ever again pass through it.
Context
8Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ.
Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn. 9Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii,
uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ),
ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii. 10Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie;
anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi.
Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;
ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ. 11Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya,
ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ.
Chineke ga-eseti nʼelu Edọm,
eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara,
na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu. 12Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze.
Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.