Aịzaya 34:13
Isaiah 34:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile; ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu, ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa na nke ikwighịkwighị.
Isaiah 34:13 in English
Isaiah 34:13 · Berean Standard Bible
Her towers will be overgrown with thorns, her fortresses with thistles and briers. She will become a haunt for jackals,* an abode for ostriches.*
Context
11Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya,
ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ.
Chineke ga-eseti nʼelu Edọm,
eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara,
na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu. 12Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze.
Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa. 13Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile;
ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu,
ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa
na nke ikwighịkwighị. 14Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ.
Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa.
Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha,
chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike. 15Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ.
Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya,
lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha.
Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa,
nke ọbụla na ibe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.