Native Bible

Isaiah 34:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ. Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya, lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha. Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa, nke ọbụla na ibe ya.

Isaiah 34:15 in English

Isaiah 34:15 · Berean Standard Bible

There the owl will make her nest; she will lay and hatch her eggs and gather her brood under her shadow. Even there the birds of prey will gather, each with its mate.

Context

13Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile; ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu, ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa na nke ikwighịkwighị. 14Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ. Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa. Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha, chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike. 15Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ. Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya, lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha. Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa, nke ọbụla na ibe ya. 16Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime: Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu. Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya, nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a. Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha. 17Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ, jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ. Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi, nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.