Aịzaya 34:15
Isaiah 34:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ. Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya, lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha. Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa, nke ọbụla na ibe ya.
Isaiah 34:15 in English
Isaiah 34:15 · Berean Standard Bible
There the owl will make her nest; she will lay and hatch her eggs and gather her brood under her shadow. Even there the birds of prey will gather, each with its mate.
Context
13Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile;
ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu,
ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa
na nke ikwighịkwighị. 14Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ.
Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa.
Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha,
chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike. 15Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ.
Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya,
lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha.
Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa,
nke ọbụla na ibe ya. 16Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime:
Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu.
Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya,
nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a.
Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha. 17Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ,
jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ.
Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi,
nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.