Native Bible

Isaiah 34:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ, jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ. Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi, nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Isaiah 34:17 in English

Isaiah 34:17 · Berean Standard Bible

He has allotted their portion; His hand has distributed it by measure. They will possess it forever; they will dwell in it from generation to generation.

Context

15Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ. Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya, lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha. Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa, nke ọbụla na ibe ya. 16Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime: Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu. Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya, nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a. Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha. 17Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ, jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ. Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi, nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.