Aịzaya 34:16
Isaiah 34:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime: Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu. Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya, nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a. Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha.
Isaiah 34:16 in English
Isaiah 34:16 · Berean Standard Bible
Search and read the scroll of the LORD: Not one of these will go missing, not one will lack her mate, because He has ordered it by His mouth, and He will gather them by His Spirit.
Context
14Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ.
Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa.
Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha,
chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike. 15Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ.
Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya,
lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha.
Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa,
nke ọbụla na ibe ya. 16Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime:
Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu.
Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya,
nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a.
Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha. 17Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ,
jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ.
Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi,
nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.