Aịzaya 34:6
Isaiah 34:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara, abụba kpuchikwara ya, ọbara ụmụ atụrụ na mkpi na abụba sitere nʼakụrụ ebule nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra. O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm.
Isaiah 34:6 in English
Isaiah 34:6 · Berean Standard Bible
The sword of the LORD is bathed in blood. It drips with fat— with the blood of lambs and goats, with the fat of the kidneys of rams. For the LORD has a sacrifice in Bozrah, a great slaughter in the land of Edom.
Context
4Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze,
a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ,
kpakpando niile ga-ada
dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ,
dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ. 5Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe,
lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm,
ndị m mara ikpe mbibi. 6Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara,
abụba kpuchikwara ya,
ọbara ụmụ atụrụ na mkpi
na abụba sitere nʼakụrụ ebule
nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra.
O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm. 7Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa,
ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta.
Ala ga-ejupụta nʼọbara ha.
Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha. 8Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ.
Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.