Aịzaya 34:4
Isaiah 34:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze, a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ, kpakpando niile ga-ada dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ, dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ.
Isaiah 34:4 in English
Isaiah 34:4 · Berean Standard Bible
All the stars of heaven will be dissolved. The skies will be rolled up like a scroll, and all their stars will fall like withered leaves from the vine, like foliage from the fig tree.
Context
2Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe,
iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile.
Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam,
nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha. 3Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ.
Ozu ha ga-esikwa isi.
Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha. 4Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze,
a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ,
kpakpando niile ga-ada
dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ,
dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ. 5Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe,
lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm,
ndị m mara ikpe mbibi. 6Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara,
abụba kpuchikwara ya,
ọbara ụmụ atụrụ na mkpi
na abụba sitere nʼakụrụ ebule
nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra.
O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.