Aịzaya 34:2
Isaiah 34:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe, iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile. Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam, nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha.
Isaiah 34:2 in English
Isaiah 34:2 · Berean Standard Bible
The LORD is angry with all the nations and furious with all their armies. He will devote them to destruction;* He will give them over to slaughter.
Context
1Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị.
Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa.
Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya,
na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ. 2Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe,
iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile.
Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam,
nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha. 3Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ.
Ozu ha ga-esikwa isi.
Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha. 4Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze,
a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ,
kpakpando niile ga-ada
dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ,
dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.