Aịzaya 34:3
Isaiah 34:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ. Ozu ha ga-esikwa isi. Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha.
Isaiah 34:3 in English
Isaiah 34:3 · Berean Standard Bible
Their slain will be left unburied, and the stench of their corpses will rise; the mountains will flow with their blood.
Context
1Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị.
Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa.
Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya,
na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ. 2Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe,
iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile.
Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam,
nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha. 3Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ.
Ozu ha ga-esikwa isi.
Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha. 4Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze,
a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ,
kpakpando niile ga-ada
dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ,
dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ. 5Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe,
lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm,
ndị m mara ikpe mbibi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.