Native Bible

Isaiah 30:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu onye nʼime ndị iro unu ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ. Mmadụ ise si nʼime ha ezuola ịchusasị unu, ruo mgbe unu ga-adị ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu, e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.”

Isaiah 30:17 in English

Isaiah 30:17 · Berean Standard Bible

A thousand will flee at the threat of one; at the threat of five you will all flee, until you are left alone like a pole on a mountaintop, like a banner on a hill.

Context

15Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị, “Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu, na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị, ma unu ekweghị na nke ọbụla. 16Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’ E, unu ga-agba ọsọ nʼezie. Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’ Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa. 17Otu onye nʼime ndị iro unu ga-achụ puku mmadụ nʼime unu ọsọ. Mmadụ ise si nʼime ha ezuola ịchusasị unu, ruo mgbe unu ga-adị ka osisi a manyere ọkọlọtọ debe nʼelu ugwu, e, ka ọkọlọtọ a hapụrụ nʼelu ugwu nta.” 18Ma Onyenwe anyị nọkwa na-echere ka unu bịakwute ya, ka o gosi unu ịhụnanya ya. O jikeere imere unu ebere, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ngọzị na-adịkwara ndị niile na-ele anya inyeaka ya. 19Unu ndị Zayọn ndị bi na Jerusalem, ndị nke m, unu agaghị ebekwa akwa ọzọ, nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye obi ebere. Ọ ga-enyere unu aka mgbe ọbụla unu kpọkuru ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.